Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ịgba Mbọ? — Ntọala — Ajụjụ Baịbụl
Maka nkọwa ọ bụla dị n'okpuru, họrọ ihe amaokwu ahụ na-akụzi. Akara gị ga-apụta na njedebe.
Nke a bụ ajụjụ a na-enye akara. Gafee ya iji nweta ihe ga-abara gị uru banyere Asambodo Nkwado Ozi Gị.
2 Pita 1:5 — Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ________ nʼelu ịdị mma
amara
ọmụma
ọchịchọ
Ilu 12:24 — Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị ________ mmanye.
chere
nʼọrụ
na-abụghị
Ilu 15:19 — Eji ________ gbochie ụzọ onye umengwụ, ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.
ogwu
ọbịa
ojii
Ilu 18:9 — Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye ________.
mbibi
aghụghọ
ahụhụ
Ilu 19:24 — Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị ________ nʼọnụ ya.
tinye
amara
nʼudo
Ilu 21:25 — Oke ________ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.
mmalite
ọbịa
ọchịchọ
Ilu 24:30 — Esitere m nʼubi otu onye ________ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche
ụra
ọbụbụ
umengwụ
Ilu 19:15 — Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka ________ na-agụ.
ohi
oriọna
agụụ
Ilu 6:6 — Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye ________. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.
ihere
aṅụ
umengwụ
Ilu 12:27 — Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike ________ site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.
na-enye
ụwa
na-eri
Ilu 13:4 — Ndị umengwụ ________ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
na-achọ
ụwa
na-eme
Ilu 21:5 — Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta ________, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ.
uru
aghụghọ
ọṅụ
Ilu 11:27 — Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ________, ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.
nganga
ihuọma
ọchịchọ
Ndị Hibru 11:6 — Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ________.
họpụtara
ụgwọ
nʼobi
Ọrụ Ndị Ozi 18:24 — Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ ________, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma.
Apọlọs
Tọmọs
Gaiọs
2 Pita 3:14 — Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ________ na ndị ha na ya dị nʼudo.
uru
amara
ụta
2 Pita 3:10 — Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị ________ ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya.
nʼeluigwe
ịhụnanya
ngwangwa
Ndị Hibru 6:11 — Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu ________ anya ya mgbe oge ruru.
ụta
mkpa
na-atụ
Ndị Hibru 12:15 — Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya ________ ọtụtụ mmadụ.
na-atụ
Sọdọm
merụọ
2 Pita 1:10 — Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na ________ unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.
alụkwaghị
nhọpụta
inyeaka
2 Pita 1:3 — O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị ________ ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.
mkpa
aha
ugwu
1 Pita 2:9 — Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị ________ eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube.
nchụaja
nʼakwụkwọ
mmehie
Ndị Filipai 4:8 — Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe ________ nʼihi ya.
otuto
ekele
mmụọ
Ndị Filipai 4:6 — Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ________, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.
ekele
nʼakwụkwọ
ohu
Ndị Rom 12:1 — Ya mere, ________ m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.
ebube
aka
ụmụnna
2 Ndị Kọrint 10:3 — Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu ________ dịka usoro anụ ahụ si dị.
hụrụ
naanị
agha
Ndị Filipai 2:5 — Na mmekọrịta unu na ________ unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst:
ibe
kpọrọ
họpụtara
Ndị Rom 8:6 — Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na ________.
nʼanya
naanị
udo
Aịzaya 26:3 — Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee ________ zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.
udo
ìhè
nso
Njikọ ahụ ekopịala
Ọ bụ na ọmụmụ ihe a enyerela gị aka? Kesaa akụkọ nkenke ma ọ bụ akụkọ gị zuru ezu — akụkọ gị ga-enyere onye ọzọ aka ịchọta saịtị a.
Chekwaa ọganihu gị
Ọ bụghị mmanye. Ị chọghị akaụntụ iji jiri saịtị a.
Chekwaa akara ule gị na asambodo gị ọ bụrụ na ị gbanwee ekwentị gị ma ọ bụ hichapụ ndekọ ihuenyo gị.
Weghachite ọganihu
Iweghachi na-agbanwe ọganihu dị na ngwaọrụ a, ọ bụrụkwa na ị bipụta akwụkwọ mmeri mgbe ọ gasịrị, ọ ga-eji aha dị na ndekọ.



