Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Amamihe? — Ime Ya N'ezie — Ajụjụ Baịbụl
Maka nkọwa ọ bụla dị n'okpuru, họrọ ihe amaokwu ahụ na-akụzi. Akara gị ga-apụta na njedebe.
Nke a bụ ajụjụ a na-enye akara. Gafee ya iji nweta ihe ga-abara gị uru banyere Asambodo Nkwado Ozi Gị.
Jemis 1:5 — Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye ________ onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.
na-enye
nʼanya
na-achọ
Ilu 2:3 — E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ________ ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị
ọmụma
mmụọ
ihuọma
Ilu 2:4 — ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ________ maọbụ akụ nke zoro ezo
mmanya
ọlaọcha
ihuọma
Ilu 2:6 — Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ________ na-esi abịa.
ikpe
ọcha
ọmụma
Ilu 9:10 — Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ________ banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
ọmụma
karịa
mmụọ
Job 28:28 — Ọ sịrị mmadụ, “Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, ị sị nʼihe ________ wezuga onwe bụ nghọta.”
ọma
eluigwe
ọjọọ
Ilu 4:7 — ________ amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.
ọchịchọ
ọbịa
Mmalite
Ilu 8:17 — Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile ________ m aghakwaghị ịchọta m.
ọrụ
na-achọ
mmehie
Matiu 7:7 — “Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, ________ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ.
kụọkwanụ
na-adọgbu
obodobo
Ilu 4:6 — Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya ________, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
egwu
nʼanya
karịa
Ilu 3:22 — nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma ________ nʼolu gị.
olileanya
ọchịchọ
amara
Diuteronomi 4:6 — Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ________ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.”
ọrụ
ụkpụrụ
nta
Ndị Efesọs 5:15 — Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị ________, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.
nzuzu
ihu
ozizi
Ekiliziastis 9:14 — Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a ________ na-achọ ịkwatu mgbidi ya.
ntị
mmehie
gburugburu
Ekiliziastis 9:15 — Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye ________ ihe banyere ya.
gbapụtara
chetara
ndina
Ekiliziastis 9:16 — Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara ________ karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe.
uru
ziri
iwe
Ilu 24:5 — Onye maara ihe ________ site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.
na-agha
na-emeri
na-echere
2 Ndị Kọrint 10:4 — Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke ________ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi.
isi
ọtụtụ
mmụọ
Ndị Efesọs 6:17 — Nabatanụ nzọpụta dị ka ________ igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.
okpu
na-arụpụta
na-eṅomi
2 Timoti 3:15 — Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka ________ site nʼokwukwe i nwere nʼime Kraịst Jisọs.
nzọpụta
Sameria
Kenan
Matiu 10:16 — “Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti ________. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru.
agụ
gbaghara
umengwụ
Jemis 3:15 — Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị ________ bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ.
kwa
eziokwu
nʼeluigwe
Jemis 3:17 — Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme ________, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.
obiọma
ahụhụ
akụkụ
1 Ndị Kọrint 1:24 — Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị ________, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke.
Geshọn
Griik
Periz
Ndị Kọlọsị 2:3 — Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ________ dị.
ido
enyi
ọmụma
1 Ndị Kọrint 2:7 — Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị ________.
otuto
nʼakwụkwọ
ọjọọ
Ilu 8:22 — “Onyenwe anyị kpụrụ m dịka ________ ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.
ọbịa
mmalite
onyinye
Daniel 12:3 — Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe ________ eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi.
mbara
enyi
ọnụahịa
Ilu 3:35 — Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ________.
ahụhụ
ụra
ihere
Njikọ ahụ ekopịala
Ọ bụ na ọmụmụ ihe a enyerela gị aka? Kesaa akụkọ nkenke ma ọ bụ akụkọ gị zuru ezu — akụkọ gị ga-enyere onye ọzọ aka ịchọta saịtị a.
Chekwaa ọganihu gị
Ọ bụghị mmanye. Ị chọghị akaụntụ iji jiri saịtị a.
Chekwaa akara ule gị na asambodo gị ọ bụrụ na ị gbanwee ekwentị gị ma ọ bụ hichapụ ndekọ ihuenyo gị.
Weghachite ọganihu
Iweghachi na-agbanwe ọganihu dị na ngwaọrụ a, ọ bụrụkwa na ị bipụta akwụkwọ mmeri mgbe ọ gasịrị, ọ ga-eji aha dị na ndekọ.



